1Nʼezie, Chineke dịịrị Izrel mma, dịkwara ndị obi ha dị ọcha.
2Ma mụ onwe m, ọ fọdụrụ nwantịị ka m zọhie ụkwụ, ọ fọdụrụ nwantịị ka ụkwụ m gbụchapụ.
3Nʼihi na e kwosara m ndị mpako ekworo; mgbe m hụrụ ịba ụba nke ndị ajọ omume.
4Ha anaghị adọgbu onwe ha; ahụ ha gbara abụba, siekwa ike.