1Chineke, gịnị mere i ji jụ anyị ruo mgbe ebighị ebi? Gịnị mere iwe gị ji akwụ anwụrụ megide igwe atụrụ ndị ị na-azụ?
2Cheta mba ahụ nke ị zụtara na mgbe ochie, ebo ahụ bụ ihe nketa gị, ndị ị gbapụtara, nʼugwu Zayọn ebe i biri.
3Tụgharịa nzọ ụkwụ gị bịa na mbibi ebighị ebi ndị a. Ọ bụ onye iro wetara ịla nʼiyi a niile nʼụlọnsọ a.