18O Onyenwe anyị, cheta otu onye iro si chịa gị ọchị, na otu ndị nzuzu si kwaa aha gị emo.
19Ewerala ndụ nduru gị nyefee anụ ọhịa ọjọọ nʼaka. Echefukwala ndụ ndị gị a na-akpagbu ruo mgbe ebighị ebi.
20Chetakwa ọgbụgba ndụ gị, nʼihi na ihe ike na-ejupụta ebe niile gbara ọchịchịrị nʼala a.
21Ekwela ka ndị a na-akpagbu gbaghachi azụ nʼihere; ka ndị ogbenye na ndị nọ na mkpa too aha gị.
22O Chineke, bilie, kpechitara onwe gị ikpe. Chetakwa otu ndị nzuzu si kọọ gị ọnụ ogologo ụbọchị niile.