16Ehihie na abalị bụ nke gị. I mere ka anyanwụ na ọnwa guzosie ike.
17Ọ bụ gị kewapụtara oke ala niile nke ụwa. Ọ bụ gị mere ka ọkọchị na udu mmiri dị.
18O Onyenwe anyị, cheta otu onye iro si chịa gị ọchị, na otu ndị nzuzu si kwaa aha gị emo.
19Ewerala ndụ nduru gị nyefee anụ ọhịa ọjọọ nʼaka. Echefukwala ndụ ndị gị a na-akpagbu ruo mgbe ebighị ebi.
20Chetakwa ọgbụgba ndụ gị, nʼihi na ihe ike na-ejupụta ebe niile gbara ọchịchịrị nʼala a.