5Ha kpara agwa dịka ndị ikom ji anyụike ha ga-eji gbutuo ọtụtụ osisi dị nʼoke ọhịa.
6Ha ji anyụike na egbugbu ha kụjisie ihe niile eji amachi ihe bụ nke egbunyere ihe.
7Ha kpọkwara ụlọnsọ gị ọkụ, mee ya ka o repịa. Ha merụrụ ụlọ obibi ahụ a kpọkwasịrị aha gị.
8Ha sịrị nʼobi ha, “Anyị ga-etipịa ha kpamkpam!” Ha kpọrọ ebe niile a na-anọ efe Chineke nʼala a ọkụ.
9Enyeghị anyị ihe ịrịbama ọbụla site nʼaka Chineke. Ọ dịkwaghị ndị amụma fọdụrụ. Ọ dịkwaghị onye ọbụla nʼetiti anyị onye maara, mgbe ihe a ga-agwụ.