11Gee ntị nʼịsụ ude nke ndị nọ nʼụlọ mkpọrọ; site nʼike nke aka gị chebe ndị niile a mara ikpe ọnwụ.
12Bọọ ọbọ ugboro asaa megide ndị agbataobi anyị nʼihi ụta ha tara gị, O Onyenwe anyị.
13Mgbe ahụ, anyị bụ ndị gị, ụmụ igwe atụrụ gị ga-eto gị ruo mgbe niile ebighị ebi; anyị ga na-ekwupụta otuto gị, site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ.