1O Chineke, mba dị iche iche abatala nʼihe nketa gị; ha emerụọla ụlọnsọ ukwuu gị, ha etikpọọla Jerusalem, mee ka ọ tọgbọrọ nʼefu.
2Ha ewerela ozu ndị ohu gị nye anụ ufe niile nke eluigwe ka ọ bụrụ ihe oriri nye ha, werekwa ozu nke ndị nsọ gị nye anụ ọhịa niile nke ụwa.
3Ha awụpụla ọbara dịka mmiri nʼakụkụ niile nke Jerusalem, ọ dịghị otu onye fọdụrụ nke ga-eli ndị nwụrụ anwụ.
4Anyị aghọọla ihe ịta ụta nʼebe ndị agbataobi anyị nọ, ghọọkwara ndị gbara anyị gburugburu ihe ịchị ọchị, na ihe ịkwa emo.