2Bidonụ iti egwu, kụọ ihe iti egwu, kpọọnụ ụbọ akwara na-enye abụ ụtọ na une.
3Fụọnụ opi ike nʼoge ọnwa ọhụrụ, na mgbe ọnwa gbapụtara nʼuju ya, nʼụbọchị mmemme anyị;
4nke a bụ iwu dịrị Izrel, ụkpụrụ Chineke nke Jekọb.
5O mere ka o guzosie ike dịka iwu nye Josef mgbe ọ pụrụ imegide Ijipt. Anụkwara m olu nʼasụsụ nke m na-amaghị, ka ọ na-asị:
6“Ewezugala m ibu arọ site nʼubu ha; aka ha abụọ nwere onwe ha site nʼịrụ ọrụ.