6“Ewezugala m ibu arọ site nʼubu ha; aka ha abụọ nwere onwe ha site nʼịrụ ọrụ.
7Nʼime ihe mgbu unu, unu kpọrọ oku, anapụtara m unu, azara m unu site nʼegbe eluigwe; anwara m unu na mmiri nke Meriba. Sela
8“Nụrụnụ, ndị m, aga m adọ unu aka na ntị, a sịkwarị na unu ga-ege m ntị, unu ndị Izrel!
9Unu agaghị enwe chi ndị mba ọzọ nʼetiti unu; unu agaghị akpọkwa isiala nye chi si ala ọzọ.
10Abụ m Onyenwe anyị Chineke unu, onye kpọpụtara unu site nʼala Ijipt. Meghe ọnụ unu ka ọ saa mbara, aga m emeju ya.