1Gee m ntị, O Onyenwe anyị, ma zakwa m, nʼihi na abụ m ogbenye na onye nọ na mkpa.
2Chebe ndụ m, nʼihi na m na-erubere gị isi; zọpụta ohu gị onye nke na-atụkwasị gị obi. Ị bụ Chineke m;
3meere m ebere, O Onyenwe m, nʼihi na ana m akpọku gị ogologo ụbọchị niile.