29Aga m eme ka agbụrụ ya guzosie ike ruo mgbe ebighị ebi, ocheeze ya ga-adịgidekwa dịka eluigwe na-adịgide.
30“Ọ bụrụ na ụmụ ya elefuo iwu m niile anya, gharakwa ijegharị nʼụzọ m niile,
31ọ bụrụ na ha elelịa ụkpụrụ m niile anya, hapụkwa idebe ihe m nyere ha nʼiwu,
32aga m eji mkpọrọ taa ha ahụhụ maka mmehie ha, tikwaa ha ụtarị maka njehie ha;
33ma agaghị m ewezuga ịhụnanya m, nʼebe ha nọ. Ma ọ bụ laa azụ nʼikwesị ntụkwasị obi m.