31ọ bụrụ na ha elelịa ụkpụrụ m niile anya, hapụkwa idebe ihe m nyere ha nʼiwu,
32aga m eji mkpọrọ taa ha ahụhụ maka mmehie ha, tikwaa ha ụtarị maka njehie ha;
33ma agaghị m ewezuga ịhụnanya m, nʼebe ha nọ. Ma ọ bụ laa azụ nʼikwesị ntụkwasị obi m.
34Agaghị m emerụ ọgbụgba ndụ m. Agakwaghị m agbanwe ihe ọbụla siterela nʼọnụ m pụta.
35Ejirila m ịdị nsọ m ṅụọ iyi, kpebie na m apụghị ịghara Devid ụgha,