35Ejirila m ịdị nsọ m ṅụọ iyi, kpebie na m apụghị ịghara Devid ụgha,
36na agbụrụ ya ga-adịgide ruo mgbe ebighị ebi, ocheeze ya ga-adịgidekwa nʼihu m ka anyanwụ na-adịgide.
37Ọ ga-adịgide ruo ebighị ebi dịka ọnwa. E, dịka ọnwa ahụ, onye akaebe m kwesiri ntụkwasị obi na mbara eluigwe.” Sela
38Ma ị jụla, i werela nlelị jụkwa, i na-ewe iwe dị ukwu megide onye gị e tere mmanụ.
39Ị jụla ọgbụgba ndụ gị na ohu gị gbara i merụọla okpueze ya nʼime ntụ dị nʼala.