36na agbụrụ ya ga-adịgide ruo mgbe ebighị ebi, ocheeze ya ga-adịgidekwa nʼihu m ka anyanwụ na-adịgide.
37Ọ ga-adịgide ruo ebighị ebi dịka ọnwa. E, dịka ọnwa ahụ, onye akaebe m kwesiri ntụkwasị obi na mbara eluigwe.” Sela
38Ma ị jụla, i werela nlelị jụkwa, i na-ewe iwe dị ukwu megide onye gị e tere mmanụ.
39Ị jụla ọgbụgba ndụ gị na ohu gị gbara i merụọla okpueze ya nʼime ntụ dị nʼala.
40Ị kụtuola mgbidi gbara ya gburugburu, i meela ka ebe ya niile e wusiri ike bụrụ ihe dapịara adapịa.