11Bụkuonụ Onyenwe anyị abụ otuto, bụ onye nọ nʼocheeze ya na Zayọn. Kwusaaranụ mba niile ihe banyere ọrụ ebube ya.
12Nʼihi na onye ahụ na-abọrọ ndị e gburu egbu ọbọ anaghị echefu ihe; ọ dịghị elefu mkpu akwa nke ndị a na-akpagbu anya.
13O Onyenwe anyị, lee ka ndị iro m si akpagbu m! Meere m ebere ma napụta m site nʼọnụ ọnwụ,
14ka m nwee ike ikwusa banyere otuto gị nʼọnụ ụzọ ama niile nke ada Zayọn, nọrọkwa ebe ahụ ṅụrịa ọṅụ nʼime nzọpụta gị.
15Ndị mba niile adabala nʼime olulu ahụ ha gwuru; ọnya ahụ ha siri, zoo, amaala ha.