1O Onyenwe anyị, aga m esite nʼala ala obi m too gị, aga m agwakwa onye ọbụla ihe ọma niile ị na-eme.
2Obi ga-atọ m ụtọ; obi m ga-ejupụta nʼọṅụ nʼihi gị, aga m abụrụ gị abụ otuto, gị Onye kachasị ihe niile elu.
3Ndị iro m na-alaghachi azụ, ha na-asọ ngọngọ na-alakwa nʼiyi nʼihu gị.
4I kpeela ikpe m nʼụzọ ziri ezi, nʼocheeze gị ka ị nọdụrụ na-ekpe ikpe ziri ezi.