3Ị na-eme ka mmadụ laghachi bụrụ aja mgbe i kwuru okwu sị, “Unu ụmụ mmadụ, laghachi bụrụ aja.”
4Puku afọ dị nʼanya gị dịka otu ụbọchị; ha dịka ụnyaahụ gafere agafe maọbụ ka otu awa nke anyasị.
5Nʼime ụra nke ọnwụ ka ị na-ekpochapụ mmadụ; ha dịka ahịhịa ọhụrụ nke na-epupụta nʼisi ụtụtụ,
6ọ bụ ezie na ọ na-agbawa ụzarị na-etokwa eto nʼụtụtụ, ma nʼanyasị, ọ na-akpọnwụ ma-achanwụkwaa.
7E meela ka anyị gwụsịa nʼihi oke iwe gị megide anyị; anyị na-amakwa jijiji nʼihi ọnụma gị.