Abụ Ọma 96

Bụkuonụ Onyenwe anyị abụ ọhụrụ, bụkuonụ Onyenwe anyị abụ, unu ụwa niile.

Psalm 96:1 (UKJV) O sing unto the LORD a new song: sing unto the LORD, all the earth.

1Bụkuonụ Onyenwe anyị abụ ọhụrụ, bụkuonụ Onyenwe anyị abụ, unu ụwa niile.

2Bụkuonụ Onyenwe anyị abụ, toonu aha ya; kwupụtanụ nzọpụta ya site nʼotu ụbọchị ruo nʼụbọchị nke ọzọ.

3Kwusaanụ ebube ya nʼetiti mba niile, kọsakwanụ banyere oke ọrụ ya niile nʼetiti ndị niile dị iche iche.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.