Mkpughe 1

Otu a ka Onyenwe anyị Chineke kwuru, “Abụ m Alfa na Omega, onye na-adị, onye ahụ dịkwaarị, na onye ahụ na-aga ịbịa, bụ onye pụrụ ime ihe niile.”

Revelation 1:8 (UKJV) I am Alpha and Omega, the beginning and the ending, says the Lord, which is, and which was, and which is to come, the Almighty.

6O mere ka anyị bụrụ alaeze, ndị nchụaja nye Nna ya bụ Chineke. Ọ bụ ya ka otuto niile na ike niile dịịrị ruo mgbe niile ebighị ebi. Amen.

7“Lee, ọ na-abịa ya na igwe ojii. Anya niile ga-ahụkwa ya, ọ bụladị ndị ahụ niile mapuru ya ahụ, ha ga-ahụ ya.” Mmadụ niile nọ nʼụwa “ga-erukwa ụjụ nʼihi ya.” Otu a ka ọ ga-adị! Amen.

8Otu a ka Onyenwe anyị Chineke kwuru, “Abụ m Alfa na Omega, onye na-adị, onye ahụ dịkwaarị, na onye ahụ na-aga ịbịa, bụ onye pụrụ ime ihe niile.”

9Mụ onwe m, Jọn, nwanne unu nwoke, onye unu na ya na-enwekọ ahụhụ na nʼalaeze, na ntachiobi nke bụ oke anyị nʼime Jisọs. Anọ m nʼogbe ala ntakịrị mmiri gbara gburugburu a na-akpọ Patmọs nʼihi okwu Chineke na-agba ama banyere Kraịst.

10Nʼụbọchị Onyenwe anyị, anọ m nʼime Mmụọ ma nụ otu oke olu dara ụda dị ka opi ike nʼazụ m,

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.