7“Lee, ọ na-abịa ya na igwe ojii. Anya niile ga-ahụkwa ya, ọ bụladị ndị ahụ niile mapuru ya ahụ, ha ga-ahụ ya.” Mmadụ niile nọ nʼụwa “ga-erukwa ụjụ nʼihi ya.” Otu a ka ọ ga-adị! Amen.
8Otu a ka Onyenwe anyị Chineke kwuru, “Abụ m Alfa na Omega, onye na-adị, onye ahụ dịkwaarị, na onye ahụ na-aga ịbịa, bụ onye pụrụ ime ihe niile.”
9Mụ onwe m, Jọn, nwanne unu nwoke, onye unu na ya na-enwekọ ahụhụ na nʼalaeze, na ntachiobi nke bụ oke anyị nʼime Jisọs. Anọ m nʼogbe ala ntakịrị mmiri gbara gburugburu a na-akpọ Patmọs nʼihi okwu Chineke na-agba ama banyere Kraịst.
10Nʼụbọchị Onyenwe anyị, anọ m nʼime Mmụọ ma nụ otu oke olu dara ụda dị ka opi ike nʼazụ m,
11na-ekwu, “Dee ihe ị na-ahụ ugbu a nʼakwụkwọ zigara ya nzukọ asaa dị nʼEfesọs na Smyrna na Pegamọm na Tiatira na Sardis, na Filadelfia na Laodisia.”