9Mụ onwe m, Jọn, nwanne unu nwoke, onye unu na ya na-enwekọ ahụhụ na nʼalaeze, na ntachiobi nke bụ oke anyị nʼime Jisọs. Anọ m nʼogbe ala ntakịrị mmiri gbara gburugburu a na-akpọ Patmọs nʼihi okwu Chineke na-agba ama banyere Kraịst.
10Nʼụbọchị Onyenwe anyị, anọ m nʼime Mmụọ ma nụ otu oke olu dara ụda dị ka opi ike nʼazụ m,
11na-ekwu, “Dee ihe ị na-ahụ ugbu a nʼakwụkwọ zigara ya nzukọ asaa dị nʼEfesọs na Smyrna na Pegamọm na Tiatira na Sardis, na Filadelfia na Laodisia.”
12Mgbe m chigharịrị, lee anya ịhụ onye na-agwa m okwu, ahụrụ m ihe ịdọba oriọna asaa e ji ọlaedo kpụọ.
13Nʼetiti ihe ịdọba oriọna ndị a, ahụrụ m otu onye yiri nwa nke mmadụ, ka o guzo. O yikwasịrị onwe ya uwe mwụda. Ma o nwere ihe okike na-acha ọlaedo e ji kee gburugburu obi ya.