1Ahụrụ m mmụọ ozi ọzọ dị oke egwu ka o si nʼeluigwe na-arịdata. Igwe ojii gbara ya gburugburu. Eke na egwurugwu dịkwa ya nʼisi. Ihu ya na-egbukwa maramara dịka anyanwụ. Ụkwụ ya na-acha dịka ogidi na-enwu ọkụ.
2O ji akwụkwọ ntakịrị a fụkọtara afụkọta nʼaka ya. Otu ụkwụ ya, nke aka nri ya, ka ọ zọnyere nʼime osimiri, ma ụkwụ nke aka ekpe ya ka ọ zọkwasịrị nʼelu ala.
3O ji oke olu, nke dara ụda dịka ịgbọ ụja ọdụm, tie mkpu, egbe eluigwe asaa gbara otu mgbe ahụ.