9Ejekwuru m mmụọ ozi ahụ gwa ya ka o nye m akwụkwọ nta ahụ. Ọ sịrị m, “Nara ya, taa ya. Ọ ga-eme ka afọ gị luo ilu, ma ‘nʼọnụ gị, ọ ga-atọ gị ụtọ dịka mmanụ aṅụ.’”
10Ya mere, anaara m ya akwụkwọ nta ahụ site nʼaka mmụọ ozi ahụ taa ya. Ọ tọrọ ụtọ dịka mmanụ aṅụ nʼọnụ m, ma mgbe m lodara ya, afọ m bidoro ilu ilu.
11Mgbe ahụ ha sịrị m, “Ị ghaghị ibu amụma ọzọ banyere ọtụtụ mmadụ, na ọtụtụ mba, na ọtụtụ asụsụ na ọtụtụ ndị eze.”