Mkpughe 11

Enyere m ihe ọtụtụ osisi achara e ji atụ ihe. Agwara m sị m, “Gaa tụọ ụlọnsọ ukwu Chineke, ma tụọkwa ebe ịchụ aja dị nʼụlọnsọ ahụ, gụọ ọnụọgụgụ ndị niile na-akpọ isiala nʼebe ahụ.

Revelation 11:1 (UKJV) And there was given me a reed like unto a rod: and the angel stood, saying, Rise, and measure the temple of God, and the altar, and them that worship therein.

1Enyere m ihe ọtụtụ osisi achara e ji atụ ihe. Agwara m sị m, “Gaa tụọ ụlọnsọ ukwu Chineke, ma tụọkwa ebe ịchụ aja dị nʼụlọnsọ ahụ, gụọ ọnụọgụgụ ndị niile na-akpọ isiala nʼebe ahụ.

2Ma atụkwala ogige nke dị na mpụta ụlọnsọ ahụ, nʼihi na ewerela ya nye ndị mba ọzọ. Ha ga-azọtọkwa obodo nsọ ahụ ụkwụ iri ọnwa anọ na abụọ.

3Aga m enye mmadụ abụọ ndị ga-agbara m ama ike ka ha buo amụma otu puku ụbọchị na narị ụbọchị abụọ na iri ụbọchị isii (1,260), ha ga-eyi akwa mkpe.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.