Mkpughe 11

Ọ bụrụ na onye ọbụla achọọ imerụ ha ahụ, ọkụ ga-esi ha nʼọnụ pụta rechapụ ndị iro ha. Ọ bụrụ na onye ọbụla achọọ imerụ ha ahụ, a ga-egbu ya nʼụzọ dị otu a.

Revelation 11:5 (UKJV) And if any man will hurt them, fire proceeds out of their mouth, and devours their enemies: and if any man will hurt them, he must in this manner be killed.

3Aga m enye mmadụ abụọ ndị ga-agbara m ama ike ka ha buo amụma otu puku ụbọchị na narị ụbọchị abụọ na iri ụbọchị isii (1,260), ha ga-eyi akwa mkpe.”

4Ndị a bụ osisi oliv abụọ ahụ na ihe ịdọba oriọna abụọ ahụ, ndị na-eguzo nʼihu Onye nwe ụwa.

5Ọ bụrụ na onye ọbụla achọọ imerụ ha ahụ, ọkụ ga-esi ha nʼọnụ pụta rechapụ ndị iro ha. Ọ bụrụ na onye ọbụla achọọ imerụ ha ahụ, a ga-egbu ya nʼụzọ dị otu a.

6A ga-enyekwa ha ike imechi eluigwe ime ka mmiri ozuzo ọbụla ghara izo nʼụwa nʼime afọ atọ na ọkara ahụ ha ga-ebu amụma ha. A ga-enyekwa ha ike ime ka osimiri na mmiri nta niile ghọọ ọbara. Ha ga-enwekwa ike ime ka ụdị ọrịa dị iche iche bịakwasị ụwa niile nʼoge ọbụla ha chepụtara nʼobi ha.

7Mgbe ha gbazuru ama ha, anụ ọhịa ahụ, nke na-esite nʼime olulu Abis ahụ ga-ebuso ha agha merie ha, gbukwaa ha.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.