Mkpughe 11

A gaghị ekwenyekwa ka onye ọbụla lie ozu ha. Ma ndị niile dị iche iche nʼụwa, nʼebo niile, na asụsụ niile, na mba niile ga-agba ozu ha gburugburu ụbọchị atọ na ọkara nʼebe a tọgbọrọ ha na-ele ha anya.

Revelation 11:9 (UKJV) And they of the people and families and tongues and nations shall see their dead bodies three days and an half, and shall not suffer their dead bodies to be put in graves.

7Mgbe ha gbazuru ama ha, anụ ọhịa ahụ, nke na-esite nʼime olulu Abis ahụ ga-ebuso ha agha merie ha, gbukwaa ha.

8Mgbe ha nwụchara, ozu ha ga-atọgbọrọ nʼokporoụzọ nke obodo ukwu ahụ nke a na-akpọ na mmụọ Sọdọm na Ijipt, ebe a kpọgburu Onyenwe ha nʼobe.

9A gaghị ekwenyekwa ka onye ọbụla lie ozu ha. Ma ndị niile dị iche iche nʼụwa, nʼebo niile, na asụsụ niile, na mba niile ga-agba ozu ha gburugburu ụbọchị atọ na ọkara nʼebe a tọgbọrọ ha na-ele ha anya.

10Ndị niile bi nʼụwa ga-aṅụrị ọṅụ, nyerịta ibe ha onyinye dị iche iche, kpọọ oriri dị iche iche iji ṅụrịa ọṅụ nʼihi ogbugbu e gburu ndị amụma abụọ ahụ, ndị wetaara ha oke nhụju anya.

11Ma mgbe ụbọchị atọ na ọkara gafesịrị, Chineke ga-eme ka Mmụọ ya na-enye ndụ banyekwa nʼime ha, ha bilitere ọtọ, oke egwu jidere ndị niile hụrụ ha.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.