Mkpughe 12

Mgbe agwọ ochie ahụ chọpụtara na a chụdala ya nʼụwa, ọ chụsoro nwanyị ahụ mụrụ nwa nwoke ahụ ọsọ.

Revelation 12:13 (UKJV) And when the dragon saw that he was cast unto the earth, he persecuted the woman which brought forth the male child.

11Ha lụgburu ya nʼagha site nʼọbara Nwa atụrụ ahụ na site nʼama nke okwu ọnụ ha, nʼihi na ha ahụghị ndụ ha nʼanya karịa, kama ha jikere inye ndụ ha ọbụladị ruo nʼọnwụ.

12Ya mere, ṅụrịanụ ọṅụ eluigwe ma unu ndị niile bi nʼime ya. Ma ahụhụ dịrị unu ndị bi nʼụwa na osimiri nʼihi na ekwensu abịakwutela unu. O jirila oke ọnụma bịakwute unu. Ọ makwaara na oge a o nwere ehighị nne.”

13Mgbe agwọ ochie ahụ chọpụtara na a chụdala ya nʼụwa, ọ chụsoro nwanyị ahụ mụrụ nwa nwoke ahụ ọsọ.

14Ma e nyere nwanyị ahụ nku abụọ, nke dịka nku oke ugo, ka o jiri gbanarị agwọ ochie ahụ feba nʼime ọzara, ebe a kwadooro ya, na ebe a ga-anọ lezie ya anya afọ atọ na ọnwa isii.

15Ma agwọ ahụ meghere ọnụ ya mee ka mmiri si nʼọnụ ya sọpụta dịka iyi nke ga-ebufu nwanyị ahụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.