9Dragọn ukwu ahụ, bụ agwọ ochie ahụ a na-akpọ ekwensu maọbụ Setan, nke na-eduhie ndị niile bi nʼụwa. A tụdara ya nʼụwa, ya na ndị mmụọ ozi ya niile.
10Mgbe ahụ, anụrụ m oke olu si nʼeluigwe na-ada sị, “O mezuola nʼikpeazụ, bụ nzọpụta Chineke na ike na alaeze Chineke anyị, na ikike ịchị isi Kraịst ya, ha abụrụla ihe dị ire. Nʼihi na e sitela nʼeluigwe chụtuo onye ahụ na-ebo ụmụnna anyị ebubo. Ọ na-ebo ha ebubo ehihie na abalị nʼihu Chineke.
11Ha lụgburu ya nʼagha site nʼọbara Nwa atụrụ ahụ na site nʼama nke okwu ọnụ ha, nʼihi na ha ahụghị ndụ ha nʼanya karịa, kama ha jikere inye ndụ ha ọbụladị ruo nʼọnwụ.
12Ya mere, ṅụrịanụ ọṅụ eluigwe ma unu ndị niile bi nʼime ya. Ma ahụhụ dịrị unu ndị bi nʼụwa na osimiri nʼihi na ekwensu abịakwutela unu. O jirila oke ọnụma bịakwute unu. Ọ makwaara na oge a o nwere ehighị nne.”
13Mgbe agwọ ochie ahụ chọpụtara na a chụdala ya nʼụwa, ọ chụsoro nwanyị ahụ mụrụ nwa nwoke ahụ ọsọ.