Mkpughe 12

Dragọn ukwu ahụ, bụ agwọ ochie ahụ a na-akpọ ekwensu maọbụ Setan, nke na-eduhie ndị niile bi nʼụwa. A tụdara ya nʼụwa, ya na ndị mmụọ ozi ya niile.

Revelation 12:9 (UKJV) And the great dragon was cast out, that old serpent, called the Devil, and Satan, which deceives the whole world: he was cast out into the earth, and his angels were cast out with him.

7Mgbe ahụ, agha dapụtara nʼeluigwe. Maikel na ndị mmụọ ozi ya buru agha megide agwọ ochie ahụ (a na-akpọ dragọn). Dragọn ahụ na ndị mmụọ ozi ya bukwara agha nke ha,

8ma e meriri ha, ha enwekwaghị ọnọdụ ọbụla nʼeluigwe.

9Dragọn ukwu ahụ, bụ agwọ ochie ahụ a na-akpọ ekwensu maọbụ Setan, nke na-eduhie ndị niile bi nʼụwa. A tụdara ya nʼụwa, ya na ndị mmụọ ozi ya niile.

10Mgbe ahụ, anụrụ m oke olu si nʼeluigwe na-ada sị, “O mezuola nʼikpeazụ, bụ nzọpụta Chineke na ike na alaeze Chineke anyị, na ikike ịchị isi Kraịst ya, ha abụrụla ihe dị ire. Nʼihi na e sitela nʼeluigwe chụtuo onye ahụ na-ebo ụmụnna anyị ebubo. Ọ na-ebo ha ebubo ehihie na abalị nʼihu Chineke.

11Ha lụgburu ya nʼagha site nʼọbara Nwa atụrụ ahụ na site nʼama nke okwu ọnụ ha, nʼihi na ha ahụghị ndụ ha nʼanya karịa, kama ha jikere inye ndụ ha ọbụladị ruo nʼọnwụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.