10“Ọ bụrụ na ọ dị onye ọbụla a ga-adọta nʼagha, ọ bụ ha ka a ga-adọtakwa nʼagha. Ọ bụrụ na ọ dị onye ọbụla ga-anwụ site na mma agha, aghaghị iji mma agha gbuo ha.” Ka nke a bụrụ ihe ịgbaume na iguzosikwa ike nʼokwukwe nke ndị Chineke.
11Mgbe ahụ kwa, ahụrụ m anụ ọhịa ọzọ dị iche ka o si nʼala na-arịpụta. O nwere mpi nta abụọ dịka mpi Nwa atụrụ, kama ọ na-ekwu okwu dịka agwọ ochie ahụ.
12Ọ na-achị isi nʼọnọdụ anụ ọhịa nke mbụ. Ọ bụkwa ike a ka o ji kwagide ụwa na ndị niile bi nʼime ya ka ha kpọọ isiala nye anụ ọhịa mbụ ahụ nke a gwọrọ ọnya ya na-eweta ọnwụ.
13Ọ na-emekwa ọtụtụ oke ihe ịrịbama dị iche iche. O mere ọbụladị ka ọkụ si na mbara eluigwe daa nʼụwa nʼihu mmadụ niile.
14O duhiekwara ndị mmadụ bi nʼụwa site nʼọrụ ịrịbama ya niile nke e nyere ya ike ịrụ nʼọnọdụ anụ ọhịa ahụ. Ọ gwakwara ndị niile bi nʼụwa ka ha kpụọ ihe oyiyi nke anụ ọhịa ahụ nke e jiri mma agha merụchaa ahụ, ma mechaa dị ndụ.