Mkpughe 13

O duhiekwara ndị mmadụ bi nʼụwa site nʼọrụ ịrịbama ya niile nke e nyere ya ike ịrụ nʼọnọdụ anụ ọhịa ahụ. Ọ gwakwara ndị niile bi nʼụwa ka ha kpụọ ihe oyiyi nke anụ ọhịa ahụ nke e jiri mma agha merụchaa ahụ, ma mechaa dị ndụ.

Revelation 13:14 (UKJV) And deceives them that dwell on the earth by the means of those miracles which he had power to do in the sight of the beast; saying to them that dwell on the earth, that they should make an image to the beast, which had the wound by a sword, and did live.

12Ọ na-achị isi nʼọnọdụ anụ ọhịa nke mbụ. Ọ bụkwa ike a ka o ji kwagide ụwa na ndị niile bi nʼime ya ka ha kpọọ isiala nye anụ ọhịa mbụ ahụ nke a gwọrọ ọnya ya na-eweta ọnwụ.

13Ọ na-emekwa ọtụtụ oke ihe ịrịbama dị iche iche. O mere ọbụladị ka ọkụ si na mbara eluigwe daa nʼụwa nʼihu mmadụ niile.

14O duhiekwara ndị mmadụ bi nʼụwa site nʼọrụ ịrịbama ya niile nke e nyere ya ike ịrụ nʼọnọdụ anụ ọhịa ahụ. Ọ gwakwara ndị niile bi nʼụwa ka ha kpụọ ihe oyiyi nke anụ ọhịa ahụ nke e jiri mma agha merụchaa ahụ, ma mechaa dị ndụ.

15E nyere ya ike ikunye ume ndụ nʼime oyiyi nke anụ ọhịa mbụ ahụ, ime ka ihe a kpụrụ akpụ kwuo okwu mekwa ka e gbuo ndị niile na-akpọghị isiala nye ya.

16O nyere iwu ka onye ọbụla, onye ukwu na onye nta, ọgaranya na ogbenye, ohu na onye nwe onwe ya, nata akara nʼaka nri maọbụ nʼegedege ihu ha.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.