Mkpughe 13

Otu nʼime isi ya nwere ọnya buru ibu, nke pụrụ iwetara ya ọnwụ, e mere ka ọnya ahụ laa. Ụwa niile sobere anụ ọhịa ahụ nʼazụ nʼịtụnanya.

Revelation 13:3 (UKJV) And I saw one of his heads as it were wounded to death; and his deadly wound was healed: and all the world wondered after the beast.

1Agwọ ochie ahụ guzoro nʼakụkụ nʼọnụ oke osimiri ahụ. Ma ahụrụ m otu anụ ọhịa ka o si nʼime oke osimiri na-arịpụta. Anụ ọhịa a nwere isi asaa na mpi iri. Okpueze iri dịkwa nʼelu mpi ndị a. Aha e dekwasịrị nʼisi asaa ahụ nʼotu nʼotu bụ ikwutọ na ikwuhie Chineke.

2Anụ ọhịa a m hụrụ dị ka agụ, ma ụkwụ ya dịka ụkwụ anụ ọhịa bịa. Ọnụ ya dịkwa ka nke ọdụm. Agwọ ochie ahụ nyere ya ike ya, na ocheeze ya na ikike dị ukwuu.

3Otu nʼime isi ya nwere ọnya buru ibu, nke pụrụ iwetara ya ọnwụ, e mere ka ọnya ahụ laa. Ụwa niile sobere anụ ọhịa ahụ nʼazụ nʼịtụnanya.

4Ha kpọrọ isiala nye agwọ ochie ahụ nʼihi na o nyere anụ ọhịa ahụ ikike dị otu a. Ha bidokwara ịkpọ isiala nye anụ ọhịa ahụ, na-asị, “Ebee ka onye ahụ nọ, nke dị ukwuu karịa ya, onye pụkwara ibu agha megide ya?”

5E nyekwara anụ ọhịa ahụ ọnụ na ike ikwu okwu mpako na ikike ikwulu ekwulu ọnwa iri anọ na abụọ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.