Mkpughe 14

Ka nke a bụrụ ihe ịgbaume nye ndị nsọ ya, bụ ndị nke Chineke na-erubere iwu ya isi, na-eguzosikwa ike nʼokwukwe ha nʼime Jisọs.”

Revelation 14:12 (UKJV) Here is the patience of the saints: here are they that keep the commandments of God, and the faith of Jesus.

10ha onwe ha, aghaghị isoro ṅụọ mmanya nke oke iwe Chineke, bụ nke a na-agwaghị agwa gbanye nʼime iko ọnụma ya. A ga-ejikwa ọkụ na nkume ọkụ mekpaa ha ahụ nʼihu ndị mmụọ ozi dị nsọ na nʼihu Nwa Atụrụ ahụ.

11Anwụrụ ọkụ si nʼebe a na-emekpa ha ahụ apụta na-arịgo elu ruo mgbe niile ebighị ebi. Izuike agaghị adịrị ha ehihie na abalị bụ ndị ahụ kpọrọ isiala nye anụ ọhịa ahụ na oyiyi ya a kpụrụ akpụ, kwerekwa ka a kakwasị ha akara nke aha ya.

12Ka nke a bụrụ ihe ịgbaume nye ndị nsọ ya, bụ ndị nke Chineke na-erubere iwu ya isi, na-eguzosikwa ike nʼokwukwe ha nʼime Jisọs.”

13Anụkwara m olu nke si nʼeluigwe daa na-asị, dee ihe a nʼakwụkwọ, “Ndị a gọziri agọzi ka ha bụ, bụ ndị nwụrụ nʼime Onyenwe anyị site ugbu a gaa nʼihu.” “E, ha ga-ezu ike site na ndọgbu niile nke ha dọgburu onwe ha, nʼihi na ọrụ ha rụrụ ga-eso ha,” ka Mmụọ Nsọ na-ekwu.

14Elere m anya hụ otu igwe ọcha, nke onye nọdụrụ na ya dịka nwa nke mmadụ. O kpu okpueze e jiri naanị ọlaedo mee, jirikwa mma iwe ihe ubi dị nkọ, nʼaka ya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.