9Mgbe ahụ, mmụọ ozi nke atọ bịakwara soro ha na-eti mkpu na-asị, “Onye ọbụla na-akpọ isiala nye anụ ọhịa ahụ si nʼime mmiri rịpụta, na oyiyi ya ahụ a kpụrụ akpụ, na onye na-anarakwa akara ahụ nʼegedege ihu maọbụ nʼaka ya,
10ha onwe ha, aghaghị isoro ṅụọ mmanya nke oke iwe Chineke, bụ nke a na-agwaghị agwa gbanye nʼime iko ọnụma ya. A ga-ejikwa ọkụ na nkume ọkụ mekpaa ha ahụ nʼihu ndị mmụọ ozi dị nsọ na nʼihu Nwa Atụrụ ahụ.
11Anwụrụ ọkụ si nʼebe a na-emekpa ha ahụ apụta na-arịgo elu ruo mgbe niile ebighị ebi. Izuike agaghị adịrị ha ehihie na abalị bụ ndị ahụ kpọrọ isiala nye anụ ọhịa ahụ na oyiyi ya a kpụrụ akpụ, kwerekwa ka a kakwasị ha akara nke aha ya.
12Ka nke a bụrụ ihe ịgbaume nye ndị nsọ ya, bụ ndị nke Chineke na-erubere iwu ya isi, na-eguzosikwa ike nʼokwukwe ha nʼime Jisọs.”
13Anụkwara m olu nke si nʼeluigwe daa na-asị, dee ihe a nʼakwụkwọ, “Ndị a gọziri agọzi ka ha bụ, bụ ndị nwụrụ nʼime Onyenwe anyị site ugbu a gaa nʼihu.” “E, ha ga-ezu ike site na ndọgbu niile nke ha dọgburu onwe ha, nʼihi na ọrụ ha rụrụ ga-eso ha,” ka Mmụọ Nsọ na-ekwu.