Mkpughe 14

Mgbe ahụ, otu mmụọ ozi sitere nʼụlọnsọ ukwu pụta, tikuo onye ahụ nọkwasịrị nʼigwe ọcha sị, “Ngwa, bido iji mma iwe ihe ubi gị rụọ ọrụ, nʼihi na oge owuwe ihe ubi eruola. Ihe a ga-aghọ aghọ nʼụwa achaala nke ọma.”

Revelation 14:15 (UKJV) And another angel came out of the temple, crying with a loud voice to him that sat on the cloud, Thrust in your sickle, and reap: for the time has come for you to reap; for the harvest of the earth is ripe.

13Anụkwara m olu nke si nʼeluigwe daa na-asị, dee ihe a nʼakwụkwọ, “Ndị a gọziri agọzi ka ha bụ, bụ ndị nwụrụ nʼime Onyenwe anyị site ugbu a gaa nʼihu.” “E, ha ga-ezu ike site na ndọgbu niile nke ha dọgburu onwe ha, nʼihi na ọrụ ha rụrụ ga-eso ha,” ka Mmụọ Nsọ na-ekwu.

14Elere m anya hụ otu igwe ọcha, nke onye nọdụrụ na ya dịka nwa nke mmadụ. O kpu okpueze e jiri naanị ọlaedo mee, jirikwa mma iwe ihe ubi dị nkọ, nʼaka ya.

15Mgbe ahụ, otu mmụọ ozi sitere nʼụlọnsọ ukwu pụta, tikuo onye ahụ nọkwasịrị nʼigwe ọcha sị, “Ngwa, bido iji mma iwe ihe ubi gị rụọ ọrụ, nʼihi na oge owuwe ihe ubi eruola. Ihe a ga-aghọ aghọ nʼụwa achaala nke ọma.”

16Ya mere, onye ahụ nọkwasịrị nʼigwe ọcha ahụ rụnyere mma owuwe ihe ubi ya nʼime ụwa, ghọta ihe dị nʼụwa dịka ihe ubi.

17Mmụọ ozi ọzọ sitekwara nʼụlọnsọ ukwu dị nʼeluigwe pụta. Ya onwe ya jikwa mma owuwe ihe ubi dị nkọ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.