Mkpughe 14

Narị puku mmadụ na iri puku mmadụ anọ na anọ ndị ahụ guzo, chee ocheeze ahụ, anụ anọ ahụ dị ndụ, na ndị okenye ahụ ihu, na-abụ abụ, ha na-abụ abụ ọhụrụ. Nke naanị ha bụ ndị a gbapụtara nʼụwa pụrụ ịmụta.

Revelation 14:3 (UKJV) And they sung as it were a new song before the throne, and before the four beasts, and the elders: and no man could learn that song but the hundred and forty and four thousand, which were redeemed from the earth.

1Elere m anya hụ Nwa Atụrụ ahụ ka o guzo nʼugwu Zayọn. Ya na narị puku mmadụ na iri puku mmadụ anọ na anọ ahụ, bụ ndị e dekwasịrị aha ya na aha Nna ya nʼegedege ihu ha.

2Anụkwara m olu si nʼeluigwe na-ada dịka ụda mmiri si nʼime nkume na-asọpụta, maọbụ dịka ụda nke oke egbe eluigwe. Olu m nụrụ dịka olu ndị na-abụ abụ, ndị ji ụbọ akwara na-abụ abụ.

3Narị puku mmadụ na iri puku mmadụ anọ na anọ ndị ahụ guzo, chee ocheeze ahụ, anụ anọ ahụ dị ndụ, na ndị okenye ahụ ihu, na-abụ abụ, ha na-abụ abụ ọhụrụ. Nke naanị ha bụ ndị a gbapụtara nʼụwa pụrụ ịmụta.

4Ndị a bụkwa ndị na-emerụghị onwe ha nʼebe ụmụ nwanyị dị, nʼihi na ha dị ọcha ka ụmụ agbọghọ na-amaghị nwoke. Ha na-eso Nwa Atụrụ ahụ ebe ọbụla ọ na-aga. Ha bụ ndị a gbapụtara nʼetiti mmadụ ịbụrụ Chineke na Nwa Atụrụ ahụ dịka mkpụrụ mbụ.

5Ọ dịkwaghị okwu ụgha ọbụla a hụrụ nʼọnụ ha. Ha bụkwa ndị na-enweghị ịta ụta.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.