2Anụkwara m olu si nʼeluigwe na-ada dịka ụda mmiri si nʼime nkume na-asọpụta, maọbụ dịka ụda nke oke egbe eluigwe. Olu m nụrụ dịka olu ndị na-abụ abụ, ndị ji ụbọ akwara na-abụ abụ.
3Narị puku mmadụ na iri puku mmadụ anọ na anọ ndị ahụ guzo, chee ocheeze ahụ, anụ anọ ahụ dị ndụ, na ndị okenye ahụ ihu, na-abụ abụ, ha na-abụ abụ ọhụrụ. Nke naanị ha bụ ndị a gbapụtara nʼụwa pụrụ ịmụta.
4Ndị a bụkwa ndị na-emerụghị onwe ha nʼebe ụmụ nwanyị dị, nʼihi na ha dị ọcha ka ụmụ agbọghọ na-amaghị nwoke. Ha na-eso Nwa Atụrụ ahụ ebe ọbụla ọ na-aga. Ha bụ ndị a gbapụtara nʼetiti mmadụ ịbụrụ Chineke na Nwa Atụrụ ahụ dịka mkpụrụ mbụ.
5Ọ dịkwaghị okwu ụgha ọbụla a hụrụ nʼọnụ ha. Ha bụkwa ndị na-enweghị ịta ụta.
6Ahụkwara m mmụọ ozi ọzọ ka ọ na-efegharị nʼetiti mbara eluigwe. O ji oziọma nke ebighị ebi ahụ nʼaka, nke ọ na-aga ikwusara mba niile, na ebo niile, na asụsụ niile na mmadụ niile nọ nʼụwa.