6Ahụkwara m mmụọ ozi ọzọ ka ọ na-efegharị nʼetiti mbara eluigwe. O ji oziọma nke ebighị ebi ahụ nʼaka, nke ọ na-aga ikwusara mba niile, na ebo niile, na asụsụ niile na mmadụ niile nọ nʼụwa.
7O jiri oke olu kwuo sị, “Tụọnụ egwu Chineke, nyekwanụ ya otuto, nʼihi na oge ikpe ya eruola. Kpọọkwanụ isiala nye ya, bụ onye kere eluigwe na ala, na oke osimiri na isi iyi mmiri niile.”
8Mgbe ahụ mmụọ ozi nke abụọ bịara soro ya, na-efegharị na-asị, “ ‘Ọ daala! Ọ daala, bụ Babilọn obodo ukwu ahụ,’ bụ nke mere ka mba niile ṅụọ mmanya ọnụma nke ịkwa iko ya.”
9Mgbe ahụ, mmụọ ozi nke atọ bịakwara soro ha na-eti mkpu na-asị, “Onye ọbụla na-akpọ isiala nye anụ ọhịa ahụ si nʼime mmiri rịpụta, na oyiyi ya ahụ a kpụrụ akpụ, na onye na-anarakwa akara ahụ nʼegedege ihu maọbụ nʼaka ya,
10ha onwe ha, aghaghị isoro ṅụọ mmanya nke oke iwe Chineke, bụ nke a na-agwaghị agwa gbanye nʼime iko ọnụma ya. A ga-ejikwa ọkụ na nkume ọkụ mekpaa ha ahụ nʼihu ndị mmụọ ozi dị nsọ na nʼihu Nwa Atụrụ ahụ.