Mkpughe 16

Mmụọ ozi nke asaa wụpụrụ ihe dị nʼefere nke ya nʼikuku, otu olu sitere nʼocheeze dị nʼụlọnsọ ukwu ahụ daa ụda sị, “Emezuola ya!”

Revelation 16:17 (UKJV) And the seventh angel poured out his vial into the air; and there came a great voice out of the temple of heaven, from the throne, saying, It is done.

15“Lee! Ana m abịa dịka onye ohi. Ngọzị na-adịrị onye ahụ nọ na-eche nche, ndị yi uwe ha na njikere, ka ọ ghara ijegharị nʼọnọdụ ịgba ọtọ, bụrụ onye ọnọdụ ya na-eweta ihere.”

16Ha kpọkọrọ ndị eze ahụ nʼotu ebe a na-akpọ Amagidọn nʼasụsụ Hibru.

17Mmụọ ozi nke asaa wụpụrụ ihe dị nʼefere nke ya nʼikuku, otu olu sitere nʼocheeze dị nʼụlọnsọ ukwu ahụ daa ụda sị, “Emezuola ya!”

18Mgbe ahụ egbe eluigwe bidoro na-agba na-eme mkpọtụ, amụma bidokwara na-egbu, oke ala ọma jijiji dịkwara nʼụwa, ụdị nke na-adịbeghị site na mgbe e kere ụwa. Ọ bụ ala ọma jijiji kachasị ala ọma jijiji ndị ọzọ njọ.

19Obodo ukwu ahụ kewara ụzọ atọ. Obodo niile dị na mba niile dakwara. Chineke chetara obodo ukwu ahụ bụ Babilọn. O nyere ya iko jupụtara na mmanya nke nʼoke iwe nke ọnụma ya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.