Mkpughe 16

Mgbe ahụ egbe eluigwe bidoro na-agba na-eme mkpọtụ, amụma bidokwara na-egbu, oke ala ọma jijiji dịkwara nʼụwa, ụdị nke na-adịbeghị site na mgbe e kere ụwa. Ọ bụ ala ọma jijiji kachasị ala ọma jijiji ndị ọzọ njọ.

Revelation 16:18 (UKJV) And there were voices, and thunders, and lightnings; and there was a great earthquake, such as was not since men were upon the earth, so mighty an earthquake, and so great.

16Ha kpọkọrọ ndị eze ahụ nʼotu ebe a na-akpọ Amagidọn nʼasụsụ Hibru.

17Mmụọ ozi nke asaa wụpụrụ ihe dị nʼefere nke ya nʼikuku, otu olu sitere nʼocheeze dị nʼụlọnsọ ukwu ahụ daa ụda sị, “Emezuola ya!”

18Mgbe ahụ egbe eluigwe bidoro na-agba na-eme mkpọtụ, amụma bidokwara na-egbu, oke ala ọma jijiji dịkwara nʼụwa, ụdị nke na-adịbeghị site na mgbe e kere ụwa. Ọ bụ ala ọma jijiji kachasị ala ọma jijiji ndị ọzọ njọ.

19Obodo ukwu ahụ kewara ụzọ atọ. Obodo niile dị na mba niile dakwara. Chineke chetara obodo ukwu ahụ bụ Babilọn. O nyere ya iko jupụtara na mmanya nke nʼoke iwe nke ọnụma ya.

20Mgbe ahụ, agwa etiti niile mikpuru, ugwu niile ghọrọ ala dị larịị.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.