Mkpughe 16

Mgbe ahụ, agwa etiti niile mikpuru, ugwu niile ghọrọ ala dị larịị.

Revelation 16:20 (UKJV) And every island fled away, and the mountains were not found.

18Mgbe ahụ egbe eluigwe bidoro na-agba na-eme mkpọtụ, amụma bidokwara na-egbu, oke ala ọma jijiji dịkwara nʼụwa, ụdị nke na-adịbeghị site na mgbe e kere ụwa. Ọ bụ ala ọma jijiji kachasị ala ọma jijiji ndị ọzọ njọ.

19Obodo ukwu ahụ kewara ụzọ atọ. Obodo niile dị na mba niile dakwara. Chineke chetara obodo ukwu ahụ bụ Babilọn. O nyere ya iko jupụtara na mmanya nke nʼoke iwe nke ọnụma ya.

20Mgbe ahụ, agwa etiti niile mikpuru, ugwu niile ghọrọ ala dị larịị.

21Mkpụrụ mmiri nke ịdị arọ otu nʼime ha ruru kilogram iri anọ na ọkara, sitere nʼeluigwe na-adakwasị ndị mmadụ. Nke a mekwara ka ha kọchaa Chineke nʼihi ihe ntaramahụhụ nke mkpụrụ mmiri ahụ, nʼihi na ihe ntaramahụhụ ahụ dị nnọọ njọ nke ukwuu.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.