19Obodo ukwu ahụ kewara ụzọ atọ. Obodo niile dị na mba niile dakwara. Chineke chetara obodo ukwu ahụ bụ Babilọn. O nyere ya iko jupụtara na mmanya nke nʼoke iwe nke ọnụma ya.
20Mgbe ahụ, agwa etiti niile mikpuru, ugwu niile ghọrọ ala dị larịị.
21Mkpụrụ mmiri nke ịdị arọ otu nʼime ha ruru kilogram iri anọ na ọkara, sitere nʼeluigwe na-adakwasị ndị mmadụ. Nke a mekwara ka ha kọchaa Chineke nʼihi ihe ntaramahụhụ nke mkpụrụ mmiri ahụ, nʼihi na ihe ntaramahụhụ ahụ dị nnọọ njọ nke ukwuu.