Mkpughe 17

Otu nʼime ndị mmụọ ozi asaa ndị ahụ ji efere bịara sị m, “Bịa, aga m egosi gị ahụhụ ga-abịakwasị onye ahụ ụwa niile maara dịka akwụna, onye ahụ na-anọkwasị nʼelu ọtụtụ mmiri nke ụwa.

Revelation 17:1 (UKJV) And there came one of the seven angels which had the seven vials, and talked with me, saying unto me, Come here; I will show unto you the judgment of the great whore that sits upon many waters:

1Otu nʼime ndị mmụọ ozi asaa ndị ahụ ji efere bịara sị m, “Bịa, aga m egosi gị ahụhụ ga-abịakwasị onye ahụ ụwa niile maara dịka akwụna, onye ahụ na-anọkwasị nʼelu ọtụtụ mmiri nke ụwa.

2Ndị eze ụwa esorola ya kwaa iko nʼotu ihe ndina, emeekwara ka ndị niile bi nʼụwa bụrụ ndị mmanya ịkwa iko ya na-egbu.”

3O duuru m nʼime mmụọ baa nʼọzara. Nʼebe ahụ ka m nọ hụ otu nwanyị nọkwasịrị nʼelu otu anụ ọhịa na-acha ọbara ọbara. Anụ ọhịa ahụ nwere isi asaa na mpi iri. Aha ndị e dere anụ ọhịa ahụ nʼahụ bụ naanị okwu ikwulu Chineke.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.