Mkpughe 18

na-eti mkpu mgbe ha ga na-ele anya na-ahụ anwụrụ ọkụ na-ala elu site nʼire ọkụ ya na-asị, ‘Olee obodo ọzọ dịka obodo ukwuu a?’

Revelation 18:18 (UKJV) And cried when they saw the smoke of her burning, saying, What city is like unto this great city!

16“ ‘Ahụhụ, Ahụhụ dịrị gị, obodo ukwu ahụ, nke e yikwasịrị ezi akwa ọcha, nke na-acha odo odo na ọbara ọbara nke nya ihe ịchọ mma nke ọlaedo, nkume dị oke ọnụahịa dị iche iche na nkume pieal dị iche iche.

17Nʼotu awa a ka a lara oke akụ niile ndị a nʼiyi.’ “Ndị niile nwee ụgbọ na-aga nʼoke osimiri, na ndị na-akwọ ụgbọ ndị ahịa nʼoke osimiri, na ndị niile na-eso ụgbọ mmiri ga-anọ nʼebe tere anya,

18na-eti mkpu mgbe ha ga na-ele anya na-ahụ anwụrụ ọkụ na-ala elu site nʼire ọkụ ya na-asị, ‘Olee obodo ọzọ dịka obodo ukwuu a?’

19Ha ga-ekpokwasị aja nʼisi igosi obi ọjọọ ha na-eti mkpu akwa na-asị, “ ‘Ahụhụ, Ahụhụ dịrị gị, obodo ukwu a maara aha ya ebe ndị niile nwere ụgbọ mmiri na-aga nʼosimiri ghọrọ ndị ọgaranya site nʼakụ dị nʼime ya. Ma ugbu a, nʼotu ntabi anya, ihe niile dị nʼime ya bụ ihe a laara nʼiyi.’

20“Ma gị eluigwe, ṅụrịa ọṅụ nʼihi ihe a dakwasịrị ya, unu ndị nsọ, ṅụrịakwanụ ọnụ, unu ndị amụma na ndị ozi, ṅụrịakwanụ ọnụ. Nʼihi na Chineke ekpeela ya ikpe nʼihi mmeso ya megide unu.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.