14“Ha ga-asị, ‘Mkpụrụ ndị ahụ niile nke na-agụ mkpụrụobi agụ e sitela nʼebe ị nọ gabiga. Ihe ọma niile i ji ebi ndụ, na ihe oke ọnụahịa niile i ji azụ afọ gị, efunarịla gị. Apụghị ịchọtakwa ha ọzọ mgbe ọbụla.’
15Ndị ahịa ahụ bara ọgaranya site nʼaka ya, ga-anọ nʼebe dị anya, nʼihi oke egwu nke ntaramahụhụ ya, na-eru ụjụ, na-ebesikwa akwa ike.
16“ ‘Ahụhụ, Ahụhụ dịrị gị, obodo ukwu ahụ, nke e yikwasịrị ezi akwa ọcha, nke na-acha odo odo na ọbara ọbara nke nya ihe ịchọ mma nke ọlaedo, nkume dị oke ọnụahịa dị iche iche na nkume pieal dị iche iche.
17Nʼotu awa a ka a lara oke akụ niile ndị a nʼiyi.’ “Ndị niile nwee ụgbọ na-aga nʼoke osimiri, na ndị na-akwọ ụgbọ ndị ahịa nʼoke osimiri, na ndị niile na-eso ụgbọ mmiri ga-anọ nʼebe tere anya,
18na-eti mkpu mgbe ha ga na-ele anya na-ahụ anwụrụ ọkụ na-ala elu site nʼire ọkụ ya na-asị, ‘Olee obodo ọzọ dịka obodo ukwuu a?’