Mkpughe 18

O ji olu dị ike tie mkpu, “ ‘Ọ daala! Ọ daala! Babilọn Obodo Ukwu ahụ adaala!’ Ọ ghọọkwala ọgba obibi ndị mmụọ ọjọọ nʼebe nzukọ mmụọ ndị ahụ na-adịghị ọcha, nʼebe nzukọ ụmụ nnụnụ rụrụ arụ nʼebe nzukọ ụmụ anụmanụ niile na-adịghị ọcha na ndị rụrụ arụ.

Revelation 18:2 (UKJV) And he cried mightily with a strong voice, saying, Babylon the great is fallen, is fallen, and is become the habitation of devils, and the hold of every foul spirit, and a cage of every unclean and hateful bird.

1Mgbe ihe ndị a niile gasịrị, ahụrụ m mmụọ ozi ọzọ ka o si nʼeluigwe na-arịdata. E nyere ya ikike dị ukwuu, ebube ya mekwara ka ihe jupụta nʼụwa.

2O ji olu dị ike tie mkpu, “ ‘Ọ daala! Ọ daala! Babilọn Obodo Ukwu ahụ adaala!’ Ọ ghọọkwala ọgba obibi ndị mmụọ ọjọọ nʼebe nzukọ mmụọ ndị ahụ na-adịghị ọcha, nʼebe nzukọ ụmụ nnụnụ rụrụ arụ nʼebe nzukọ ụmụ anụmanụ niile na-adịghị ọcha na ndị rụrụ arụ.

3Nʼihi na mba niile aṅụọla site na mmanya ọnụma nke ịkwa iko ya. Ndị eze nke ụwa sokwaara ya kwaa iko, ndị na-azụ ahịa nʼụwa aghọkwaala ndị ọgaranya site nʼoke ịba ụba nke ya.”

4Mgbe ahụ, anụkwara m olu ọzọ si nʼeluigwe na-akpọ oku na-asị, “ ‘Ndị m, sinụ nʼime ya pụta,’ ka unu ghara iketa oke na mmehie ya, ka unu gharakwa iketa oke ahụhụ ya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.