Mkpughe 18

Mgbe ahụ, anụkwara m olu ọzọ si nʼeluigwe na-akpọ oku na-asị, “ ‘Ndị m, sinụ nʼime ya pụta,’ ka unu ghara iketa oke na mmehie ya, ka unu gharakwa iketa oke ahụhụ ya.

Revelation 18:4 (UKJV) And I heard another voice from heaven, saying, Come out of her, my people, that all of you be not partakers of her sins, and that all of you receive not of her plagues.

2O ji olu dị ike tie mkpu, “ ‘Ọ daala! Ọ daala! Babilọn Obodo Ukwu ahụ adaala!’ Ọ ghọọkwala ọgba obibi ndị mmụọ ọjọọ nʼebe nzukọ mmụọ ndị ahụ na-adịghị ọcha, nʼebe nzukọ ụmụ nnụnụ rụrụ arụ nʼebe nzukọ ụmụ anụmanụ niile na-adịghị ọcha na ndị rụrụ arụ.

3Nʼihi na mba niile aṅụọla site na mmanya ọnụma nke ịkwa iko ya. Ndị eze nke ụwa sokwaara ya kwaa iko, ndị na-azụ ahịa nʼụwa aghọkwaala ndị ọgaranya site nʼoke ịba ụba nke ya.”

4Mgbe ahụ, anụkwara m olu ọzọ si nʼeluigwe na-akpọ oku na-asị, “ ‘Ndị m, sinụ nʼime ya pụta,’ ka unu ghara iketa oke na mmehie ya, ka unu gharakwa iketa oke ahụhụ ya.

5Nʼihi na mmehie ya amụbaala ruo eluigwe. Chineke echetakwala ajọ omume ya niile.

6Mesonụ ya mmeso dịka o si meso unu. Kwụghachinụ ya ụgwọ mmaji abụọ maka ihe o mere. Gwakọọrọnụ ya mmaji abụọ nʼime iko mmanya ahụ nke ọ gwakọọrọ ndị ọzọ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.