Mkpughe 18

Mesonụ ya mmeso dịka o si meso unu. Kwụghachinụ ya ụgwọ mmaji abụọ maka ihe o mere. Gwakọọrọnụ ya mmaji abụọ nʼime iko mmanya ahụ nke ọ gwakọọrọ ndị ọzọ.

Revelation 18:6 (UKJV) Reward her even as she rewarded you, and double unto her double according to her works: in the cup which she has filled fill to her double.

4Mgbe ahụ, anụkwara m olu ọzọ si nʼeluigwe na-akpọ oku na-asị, “ ‘Ndị m, sinụ nʼime ya pụta,’ ka unu ghara iketa oke na mmehie ya, ka unu gharakwa iketa oke ahụhụ ya.

5Nʼihi na mmehie ya amụbaala ruo eluigwe. Chineke echetakwala ajọ omume ya niile.

6Mesonụ ya mmeso dịka o si meso unu. Kwụghachinụ ya ụgwọ mmaji abụọ maka ihe o mere. Gwakọọrọnụ ya mmaji abụọ nʼime iko mmanya ahụ nke ọ gwakọọrọ ndị ọzọ.

7Nye ya ọtụtụ mmekpa ahụ na obi ilu dịka ndụ otuto, nʼime onwe ya obi ụtọ nke o nyere onwe ya. Ọ na-ekwu nʼobi ya na-asị, ‘Abụ m eze nwanyị nọ nʼelu ocheeze m. Abụghị m nwanyị di ya nwụrụ, iru ụjụ ọbụla adịghị nye m.’

8Nʼihi nke a, ihe ntaramahụhụ ya ga-abịakwasị ya nʼotu ụbọchị, ọnwụ na iru ụjụ nke ọnwụ na-eweta, na ụnwụ. A ga-eji ọkụ rechapụ ya, nʼihi na Onyenwe anyị Chineke onye na-ekpe ya ikpe, dị ike.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.