6Mesonụ ya mmeso dịka o si meso unu. Kwụghachinụ ya ụgwọ mmaji abụọ maka ihe o mere. Gwakọọrọnụ ya mmaji abụọ nʼime iko mmanya ahụ nke ọ gwakọọrọ ndị ọzọ.
7Nye ya ọtụtụ mmekpa ahụ na obi ilu dịka ndụ otuto, nʼime onwe ya obi ụtọ nke o nyere onwe ya. Ọ na-ekwu nʼobi ya na-asị, ‘Abụ m eze nwanyị nọ nʼelu ocheeze m. Abụghị m nwanyị di ya nwụrụ, iru ụjụ ọbụla adịghị nye m.’
8Nʼihi nke a, ihe ntaramahụhụ ya ga-abịakwasị ya nʼotu ụbọchị, ọnwụ na iru ụjụ nke ọnwụ na-eweta, na ụnwụ. A ga-eji ọkụ rechapụ ya, nʼihi na Onyenwe anyị Chineke onye na-ekpe ya ikpe, dị ike.
9“Ndị eze nke ụwa, ndị soro ya kwaa iko, ma bie ndụ ọchịchọ ọjọọ ya, ga-akwa akwa, ruo ụjụ nʼihi ya, mgbe ha ga-ahụ anwụrụ ọkụ nke ịkpọ ọkụ ya.
10Ha ga-eji oke egwu guzo nʼebe dị anya, kwaa akwa nʼihi ntaramahụhụ ya sị, “ ‘Ahụhụ, Ahụhụ dịrị gị, Babilọn, Obodo ukwu a maara aha ya gị Babilọn, obodo e ji ịdị ike maara. Nʼotu ntabi anya, ikpe nke gị na-abịa.’