Mkpughe 18

Ọ dịghị mgbe ọzọ ụzụ egwu ga-adị nʼebe ahụ. Agaghị anụkwa olu ọja na une na ụbọ akwara na nke ndị na-afụ opi ike nʼime gị ọzọ. Aghaghị ahụ onye ọrụ ǹka ọbụla nʼime gị ọzọ. Agaghị anụkwa ụzụ nkume igwe nri nʼime gị ọzọ.

Revelation 18:22 (UKJV) And the voice of harpers, and musicians, and of pipers, and trumpeters, shall be heard no more at all in you; and no craftsman, of whatsoever craft he be, shall be found any more in you; and the sound of a millstone shall be heard no more at all in you;

20“Ma gị eluigwe, ṅụrịa ọṅụ nʼihi ihe a dakwasịrị ya, unu ndị nsọ, ṅụrịakwanụ ọnụ, unu ndị amụma na ndị ozi, ṅụrịakwanụ ọnụ. Nʼihi na Chineke ekpeela ya ikpe nʼihi mmeso ya megide unu.”

21Mgbe ahụ, otu mmụọ ozi dị ukwuu tụtụlitere otu nkume nke dịka nkume igwe nri, tụba ya nʼime oke osimiri, na-asị, “Otu a ka a ga-esi tufuo Babilọn obodo ukwu ahụ, agaghị ahụkwa ya ọzọ.

22Ọ dịghị mgbe ọzọ ụzụ egwu ga-adị nʼebe ahụ. Agaghị anụkwa olu ọja na une na ụbọ akwara na nke ndị na-afụ opi ike nʼime gị ọzọ. Aghaghị ahụ onye ọrụ ǹka ọbụla nʼime gị ọzọ. Agaghị anụkwa ụzụ nkume igwe nri nʼime gị ọzọ.

23Ìhè nke sitere nʼoriọna agaghị acha nʼime gị ọzọ. Olu obi ụtọ nke nwoke na nwanyị na-alụ di na nwunye agaghị adịkwa. Ndị mgbereahịa gị bụ ndị a ma ama nʼelu ụwa, ọ bụkwa mgbaasị gị ka e ji duhie mba niile nke ụwa.

24Nʼime ya ka a hụrụ ọbara ndị amụma niile, na nke ndị nsọ niile, na nke ndị ọzọ ahụ niile e gburu nʼụwa.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.